Proverbs 1

Ihe mere e ji dee Ilu

1Ndị a bụ ilu Solomọn nwa Devid, eze Izrel.

2Ọ bụ maka amamihe na ntụziaka,
maka ịghọta okwu niile kwesiri ịghọta nke ọma,
3nʼihi inweta ntụziaka nʼinwe uche,
ime ezi omume na ikpe ziri ezi nke aghụghọ na-adịghị.
4Nʼihi ime ka ndị na-enweghị uche nwee ezi uche,
ka ndị na-eto eto nweta ihe ọmụma na izuzu ọma.
5Ka onye maara ihe gee ntị, tụkwasịkwa ihe nʼihe ọ maara,
ka ndị nwere nghọta nwetakwa ezi ndụmọdụ.
6Ka ha ghọta ilu niile na okwu niile
na-esi nʼọnụ ndị maara ihe.

7Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite ihe ọmụma.
Ọ bụkwa naanị ndị nzuzu bụ ndị na-adịghị anabata amamihe na ịdọ aka na ntị.

Okwu mmalite: Nkwado maka ịnabata amamihe

Ịdọ aka na ntị banyere ndị nrafu

8Nwa m, na-aṅa ntị na ntụziaka nke nna gị
ahapụkwala ndụmọdụ nne gị.
9Nʼihi na okpu amara ka ha ga-abụrụ isi gị,
bụrụkwa ihe ịnya nʼolu nye gị.

10Nwa m, ọ bụrụ na ndị mmehie ara gị ụra,
ekwenyerela ha, Ekwela!
11Ọ bụrụ na ha asị gị, “Bịa soro anyị; ka anyị zoo onwe anyị,
tigbuo onye ọbụla anyị hụrụ,
bụ onye na-emeghị ihe ọjọọ ọbụla.
12Ka anyị loo ha na ndụ, dịka ala ili,
loo ha kpamkpam dịka ndị na-arịda nʼolulu.
13Anyị ga-enwetakwa ọtụtụ ihe dị oke ọnụahịa,
nke anyị ga-akwaju nʼụlọ anyị.
14Soro anyị fee nza gị ka anyị nwaa ike anyị,
ihe ọbụla kwa anyị nwetara, anyị na gị ga-ekekọta ya ọnụ.”
15Nwa m, ejela ije nʼụzọ ndị dị otu a,
a zọọkwala ụkwụ nʼokporoụzọ ha;
16nʼihi na ụkwụ ha na-agba ọsọ ime ihe ọjọọ,
na-emekwa ngwangwa iwufu ọbara.
17Ọ bụ ihe abaghị uru ịgbasa ụgbụ,
nʼebe nnụnụ ọbụla na-ahụ ya anya.
18Ma ndị a na-esi ọnya nke na-ama ha.
Ha onwe ha ka ọnya ahụ ga-ejide.
19Otu a ka ọ na-adịkwara ndị ọ na-agụsị agụụ ike inweta akụnụba nʼụzọ na-ezighị ezi.
Nʼihi na ịgbaso ụzọ dị otu a na-ewetara ndị na-eso ya ọnwụ.

Jidesie amamihe aka ike

20Amamihe na-eti mkpu nʼezi ka mmadụ nụ.
Olu ya na-ada ụda nʼama.
21Ọ bụ nʼisi akụkụ ụzọ nke mkpọtụ dịkarịsịrị ka ọ na-akpọ oku,
nʼọnụ ụzọ ama obodo ka ọ na-anọ ekwupụta okwu ọnụ ya niile.

22“Unu ndị na-enweghị uche ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide bụrụ ndị ga-ahụ enweghị uche nʼanya?
Ruo ole mgbe ka ndị na-akwa emo ga-anọgide na mmasị ịkwa emo?
Ruo ole mgbe ka ndị nzuzu ga-anọgide na-akpọ ihe ọmụma asị?
23Ọ bụrụ na unu gere ntị na mba m na-abara unu,
aga m awụpụ echiche niile nke obi m nye unu,
aga m emekwa ka unu mara okwu m.
24Ma ebe ọ bụ na unu egeghị ntị mgbe m kpọrọ oku,
setịpụkwa aka m nye unu ma ọ dịghị onye ṅara ntị,
25ebe ọ bụ na unu akpọla ndụmọdụ m asị,
jụkwa ịnabata ịba mba m nye unu,
26ụbọchị unu ga-adaba na mmekpa ahụ, aga m achị ọchị.
Mgbe ihe egwu bịakwasịrị unu, aga m akwa unu emo.
27Mgbe oke ihe egwu ga-abịakwasị unu dịka ikuku dị ike,
mgbe nhụju anya ga-erubiga nʼelu unu dịka oke ifufe,
mgbe ịta ahụhụ na nsogbu ga-agbagwoju unu anya.

28“Agaghị m ege ntị nʼakwa unu, ọ bụ ezie na unu ga na-akpọ m.
Unu ga-achọkwa m ma unu agaghị achọta m.
29Nʼihi na unu mechiri anya unu nʼebe ihe ọmụma dị,
unu atụghị egwu Onyenwe anyị.
30Unu aṅaghị ntị na ndụmọdụ m.
Unu lelịrị ịba mba m anya.
31Ihe niile unu kụrụ ka unu ga-aghọta.
Ọ bụkwa ụzọ unu na ndụmọdụ unu ga-eju unu afọ.
32Nʼihi na ejezighị ije nke ndị na-enweghị uche na-egbu ha,
ọ bụkwa ọnọdụ afọ ojuju ndị nzuzu ga-alakwa ha nʼiyi.
33Ma onye na-ege ntị nʼokwu m ga-ebi obi ntụkwasị obi.
Ọ ga-anọ jụụ na-enweghị ihe ọbụla ga-atụ ya egwu.”
Copyright information for IboBIU